Romans 9:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, Chineke anaghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ chọrọ ka ọ gọzie ya. Ọ naghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ rụsịrị ọrụ ike. Kama ndị Chineke na-agọzi bụ ndị o kpebiri nꞌonwe ya igọzi, ndị o kpebiri imere ebere.
Igbo 2006
Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ dabereghị nʼọchịchọ nke mmadụ maọbụ ịrụsị ọrụ ike ya kama ọ dabere nʼebere Chineke.