Romans 9:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Fero bụ onye akwụkwọ nsọ ji maa atụ banyere mmeso Chineke na-emeso ndị mmadụ. Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke gwara Fero sị, “Emere m ka ị bụrụ eze nꞌihi na achọrọ m isite nꞌihe ọjọọ ị na-eme zipụta ike m, ka ụwa nile nụ ihe banyere m.”
Igbo 2006
N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ gwara Fero, “Emere m ka ị bụrụ ihe ị bụ nʼihi nke a, ka m were gị zipụta ike m, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.”