Romans 9:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha.
Igbo 2006
Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?