Romans 9:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke na-emekwa ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na o kpebie iji ndị dị ka anyị, o mere ka anyị jupụta nꞌebube ya, mee ihe nlere anya nye ndị ọzọ, ma anyị bụ ndị Juu, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, igosi ha otu o si emere anyị ebere.
Igbo 2006
ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.