Romans 9:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌebe ọzọ kwa, nꞌakwụkwọ nsọ, Aịzaya onye amụma kwuru sị, “Ọ bụrụ na Chineke abụghị onye obi ọma, ndị Juu nile gaara ala nꞌiyi dị ka e si laa ndị nile bi nꞌobodo Sodọm na Gomora nꞌiyi.”
Igbo 2006
Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue, Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru, Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”