Romans 9:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a? Anyị ga-asị na Chineke enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ọ bụla ha ji obi ha chọọ Chineke, ohere ịbụ ndị a ga-anabata site nꞌokwukwe,
Igbo 2006
Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,