Romans 9:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na Chineke dọrọ ha aka na ntị sị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn oke nkume ga-eme ka ụmụ mmadụ sụọ ngọngọ. Ọtụtụ mmadụ ka nkume a ga-eme ka ha daa (oke nkume a bụ Jisọs Kraịst). Ma onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi, ihere agaghị eme ya.”
Igbo 2006
dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka e dere ya, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ma onye nke kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”