Romans 9:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ndị Juu bụ ndị Chineke nyere ọtụtụ onyinye. Chineke mere ha ụmụ ya, mee ka ha keta oke nꞌebube ya. O nyere ha ọgbụgba ndụ ya, na iwu ya. O kwenyere ka ha fee ya ofufe, ma kwekwa ha nkwa ihe dị ukwuu ọ ga-emere ha.
Igbo 2006
ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
bụ ndị Izrel. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ụmụ ya, ndị o nyere ebube ya na ọgbụgba ndụ ya. O nyekwara ha iwu na ife ofufe nʼụlọnsọ ukwu ahụ na ọtụtụ nkwa dị iche iche.