Romans 9:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a na-egosi na ọ bụghị ụmụ nile a mụrụ nꞌezinụlọ Eberaham bụ ụmụ Chineke. Kama ndị bụ ụmụ Chineke bụ ụmụ Eberaham ndị kweere nkwa nzọpụta ahụ Chineke kwere Eberaham.
Igbo 2006
Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.