Ruth 2:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Boaz we si ya na mb͕e iri ihe, Biarue nso ebe a, rie ufọdu nime nri, su kwa iberibe achicha gi nime manya-vine b͕ara uka. O we nọdu n>akuku ndi n=eb#i ọka: Boaz we nye ya ọka a@nara n>ọku, ọ ta, afọ we ju ya, o we tafọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.