Ruth 2:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Boaz we si Rut, #I nughi, nwam? Ejela ichikọta n>ubi ọzọ, esi-kwa-la n>ebe a gabiga, ma ot/u a ka i g=arapara n>aru umu-ab͕ọghọm.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.