Ruth 3:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Boaz we rie ihe, @nu kwa ihe-ọ@nu@nu, obi-ya we di nma, o we ba idina ala na nsọtu obo ọka: Rut we ba nwayọ, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Boaz risiri nri ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mmụọ ya dịkwa mma, ọ gara ka ọ dinaa ala na nsọtụ ebe atụkọtara akpa ọka. Rut jiri nwayọọ gaa nʼebe ahụ, kpughepụ akwa o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ, dina nʼakụkụ ụkwụ ya.