Song of Solomon 4:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida; Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu. Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige, We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.