Song of Solomon 5:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ; Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga. Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu: Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya; Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.