Titus 1:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị ozi ọma a, nke ka nke, ndị ahụ na-asị na ọ dị mkpa ka onye nke Kraịst debe iwu ndị Juu nile nke. Ma okwu ndị a bụ okwu nzuzu, nke naegbochi ndị mmadụ iso eziokwu.
Igbo 2006
N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị, ndị na-ekwu okwu efu, na ndị aghụghọ, nke ka nke, ndị si nʼotu ndị obibi ugwu pụta.