Titus 1:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ.
Igbo 2006
Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ.