Titus 1:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ezie na ndị dị otu a na-asị na ha maara Chineke ma e lee anya nꞌomume ha, ọ na-ezipụta na ha amaghị ya. Ha bụ ndị ọjọọ, ndị rere ure na ndụ ha, ndị na-adịghị ekwenye nꞌihe ọ bụla gbasara Chineke, ndị na-enweghị ike ịrụpụta ezi ọrụ ọ bụla na ndụ ha.
Igbo 2006
Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.