Titus 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Kraịst bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nꞌihi anyị, ịgbapụta anyị site nꞌajọ omume anyị nile. Ọ bụkwa ya sachara anyị, ime ka anyị bụrụ ndị nke aka ya, ndị dị ọcha, na ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe nile.
Igbo 2006
Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.