Titus 2:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Hụ na mkparịta ụka gị nile bụ site nꞌuche zuru oke, nke guzokwa ọtọ. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla bịakwutere gị ka gị na ya rụrịtaa ụka laa nꞌihere, nꞌihi enweghị ihe ọ bụla o jidere aka ọ ga-eji kwujọọ gị.
Igbo 2006
okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n'akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n'iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.