Titus 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe ndị a m kwuru nꞌebe a bụ eziokwu. Achọrọ m ka okwu ndị a dị gị nꞌọnụ mgbe nile, meekwa ka o doo ndị gị anya. Ọ bụ ya ga-eme ka ndị nile kweere na Chineke kpọọ ime ihe ọma mkpa. Nꞌihi na ezi ọrụ bara uru. Ọ na-ewetakwa ụgwọ ọrụ.
Igbo 2006
Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, anamezube kwa ka i kwusie okwu bayere ihe ndia ike, ka ndi kweworo okwu Chineke we tukwasi uche n'ibu ndi-isi n'ọlu ọma. Ihe ndia di nma buru kwa ihe bara madu urù:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-amasị m ma i kwusie ihe ndị a ike, ka ndị kweere na Chineke, lezie anya nʼịrụ ezi ọrụ. Ihe ndị a dị mma na-abakwara mmadụ uru.