Zechariah 10:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.