Zechariah 13:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”