Zechariah 14:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze.