Zechariah 4:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha.