Zechariah 8:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya.