Zechariah 8:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M'gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa.