Zephaniah 1:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,