Zephaniah 1:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.