bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Timothy 3
1 Timothy 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
1
Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ.
2
Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.
4
Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya.
5
Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke.
6
Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya.
7
Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya.
8
Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya.
9
Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
10
Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
11
Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.
12
Ndị nile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma.
13
Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs.
14
Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a
15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.
16
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6