bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 John 1
2 John 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
1
Ọ bụ m Jọn, onye bụ okenye a họpụtara ilekọta nzukọ Kraịst na-edere gị akwụkwọ a, gị nwanyị Chineke họpụtara, na ụmụ gị, na ndị m hụkwara nꞌanya nꞌeziokwu dị ka ndị ọzọ nꞌụlọ nzukọ Kraịst si hụ ha nꞌanya.
2
Ebe ọ bụ na eziokwu ahụ anyị maara ga-adịgide nꞌime obi anyị ruo mgbe ebighị ebi,
3
Chineke Nna anyị na Jisọs Kraịst Ọkpara ya gaagọzi anyị site nꞌigosi anyị obi ọma ya na inye anyị udo ya nke dị ukwuu. Ọ ga-ejikwa eziokwu ya na ịhụnanya ya gọzie anyị.
4
Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ ụmụ gị nꞌebe a chọpụta na ha na-ebi ụdị ndụ ha kwesịrị ibi, ndụ ịgbaso eziokwu na idebe ihe Chineke nyere nꞌiwu.
5
Achọrọ m ichetara unu nke ọma nꞌebe a, ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, iwu ahụ dị ochie Chineke nyere anyị site na mmalite. Iwu ahụ na-ekwu sị, ndị Kraịst kwesịrị ịhụrịta onwe ha nꞌanya.
6
Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke nꞌanya anyị ga-eme ihe ọ bụla ọ gwara anyị mee. Chineke agwakwala anyị site na mmalite sị anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya.
7
Lezienụ anya banyere ndị ozizi ụgha jupụtara nꞌụwa taa. Ọtụtụ ha nọ nꞌetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nꞌụwa nꞌoyiyi mmadụ, na o ji ụdị anụ ahụ anyị nwere bịa. Ndị dị otu a bụ ndị iro eziokwu ahụ na ndị iro Kraịst kwa.
8
Ya mere lezienụ anya ka unu ghara iso ha ghọọ ndị na-agaghị anata ụgwọ ọrụ nke ndị nile rụrụ ezi ọrụ na-ele anya inweta. Kama rụzienụ ọrụ unu nke ọma, ka unu nwee ike ịnata ụgwọ ọrụ unu site nꞌaka Onyenwe anyị.
9
Nꞌihi na ọ bụrụ na unu esite nꞌozizi Kraịst wezuga onwe unu, unu ahapụkwala Chineke. Ma ọ bụrụ na unu anọgidesie ike nꞌozizi Kraịst, unu gaenweta Chineke nꞌonwe ya. Mgbe ahụ unu ga-enwe Chineke Nna na Ọkpara ya.
10
Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ekwenyeghị na Kraịst abịa izi unu ihe ọ bụla, unu akpọbatala ya nꞌụlọ unu. Unu anọkwala ya nso ige ntị nꞌihe ọ na-ekwu.
11
Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekwenyere ya, unu ga-aghọ ndị enyi ya, soro ya nꞌomume mmehie ha nile.
12
Otu ọ dị, enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha dum nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, anyị ga-anọ tulee okwu ndị a nile, nweekwa oge ime onwe anyị obi ụtọ.
13
Ụmụ nwanne gị nwanyị, onye ọzọ ahụ Chineke họpụtara, na-ekele gị.
Jump to:
Chapter 1
All chapters:
1