bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Peter 1
2 Peter 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
1
Ọ bụ Saịmọn Pita, odibo Jisọs Kraịst na onyeozi na-edegara ndị nile nwere ụdị okwukwe anyị nwere akwụkwọ a. Okwukwe m na-ekwu ihe banyere ya bụ ụdị okwukwe ahụ Jisọs Kraịst Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị na-enye. Ọ bụ okwukwe dị oke ọnụ ahịa, nke na-egosikwa ịdị mma onye nyere anyị ya.
2
Ka mara na udo Chineke dịnyere unu na mmaji na mmaji, ụdị udo na amara ya na-esite na mmazu unu maara ya na-abịa.
3
Chineke esitela nꞌike ya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa. O nyela anyị ihe ahụ ga-enyere anyị aka ibi ezi ndụ dị ka ndị ma onye Chineke bụ. Nꞌihi na ọ bụ ya kpọrọ anyị site nꞌebube ya na nꞌịdị mma ya.
4
Ọ bụkwa site nꞌike aka ya ka o ji nye anyị onyinye ahụ dị ukwuu, nke o kwere anyị na nkwa. Nkwa o kwere anyị, nke o mezuru, bụ nzọpụta ọ zọpụtara anyị site nꞌagụụ ihe ọjọọ nile, na ndụ rere ure nile dị nꞌụwa, na inye anyị ọdịdị ya onwe ya bụ Chineke.
5
Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,
6
ka anyị si otu a bụrụ ndị nwere ntachi obi na ndị dị nsọ.
7
Mgbe anyị mere nke a, anyị ga-agakwa nꞌihu ime ka ihe gbasara ndị ọzọ na-adị anyị mma. Nke a ga-eme ka ịhụnanya anyị nwere nꞌebe ndị ọzọ nọ baa ụba.
8
Mgbe anyị na-aga nꞌihu na-eme ihe ndị a, mgbe ha jubigakwara oke nꞌime anyị, mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nꞌihe anyị maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9
Ma onye ọ bụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nꞌokwukwe ya nọ nꞌọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na Chineke sachapụrụ mmehie ya nile ime ka o bie ndụ dị mma nꞌihu Onyenwe anyị.
10
Nꞌihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike igosi na unu so nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ họpụta. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ dapụ.
11
Chineke ga-emeghekwara unu ụzọ, nye unu ike ịbanye nꞌalaeze ahụ na-adịgide adịgide, bụ alaeze Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.
12
Ọ bụ nzube m na m ga na-echetara unu ihe ndị a site nꞌoge ruo nꞌoge. Ọ bụ ezie na unu maara ha na-eguzosikwa ike nꞌeziokwu ahụ unu natara.
13
Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoo haa na oge m nwere nꞌụwa adịkwaghị ukwuu, na m ga-anwụ nꞌoge na-adịghị anya. Ya mere, na nwa oge ahụ fọdụrụ, ana m agụ ya nꞌihe ziri ezi ịkpọtụ mmụọ unu na uche unu site nꞌichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nꞌụwa a.
15
Aga m agbalịsi ike ịhụ na a sịkwarị na m nwụọ, unu ga na-echeta ihe ndị a.
16
Ihe nile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nꞌamamihe ya. Nꞌihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbia ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya m abụọ ka m ji hụ ebube na ịma mma ya.
17
Eso m nọdụ nꞌelu ugwu ahụ dị nsọ mgbe Chineke mere ka otuto ya na nsọpụrụ ya pụta ìhè. Eji m ntị m nụrụ mgbe olu ahụ dị ebube si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ nꞌanya nke ukwuu, onye ihe ya dịkwa m ezi mma.”
19
Nꞌezie, anyị ahụla, nwapụtakwa na amụma ahụ ndị amụma buru emezuola. Ọ ga-abara unu uru ilezi anya nꞌihe ahụ nile ndị amụma dere, nꞌihi na ozi ha dị ka ìhè nke na-acha nꞌakụkụ ụlọ gbara ọchịchịrị. Okwu ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ ihe gaara esiri anyị ike ịghọta. Mgbe unu tulere eziokwu ahụ dị nꞌokwu ahụ ndị amụma kwuru, ìhè ga-enwụbata nꞌobi unu, mgbe ahụ kwa Kraịst onye dị ka kpakpando na-acha nꞌisi ụtụtụ ga-eme ka ihè ya chabata nꞌime unu.
20
Nke ka nke, chetanụ nke a, na okwu amụma ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ abụghị nke onye ọ bụla nwere ika ịkọwa otu o si dị ya mma.
21
Nꞌihi na o nweghị okwu amụma ọ bụla ndị amụma ochie sitere nꞌobi ha chepụta dee ma ọ bụ kwuo. Kama ọ bụ Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha nyere ha ozi ahụ Chineke chọrọ ka ha kwuo.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3