bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
3 John 1
3 John 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Jọn, onye a họpụtara ilekọta nzukọ Kraịst. Ana m edere gị ya Gaiọs, onye m hụrụ nꞌanya nꞌezie.
2
Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma.
3
Ụfọdụ nꞌime ụmụnna anyị nꞌime Kraịst ndị si nꞌebe a na-agafe akọọrọla m akụkọ mere ka obi tọọ m ụtọ. Akụkọ ha kọrọ bụ akụkọ banyere otu i si ebi ndụ dị ọcha na nke eziokwu, na otu ibi ndụ gị si bụrụ dị ka okwu Chineke si chọọ.
4
Nꞌezie, gịnị ọzọ pụrụ inye m ọṅụ karịrị nke m nwere, mgbe m nụrụ na ụmụ m na-ebi ndụ dị ka eziokwu ahụ ha mụtara si chọọ.
5
Ezi enyi m, ọ bụ ezi ọrụ ka ị na-arụrụ Chineke site nꞌilekọta ndị ozi ya naesite nꞌebe ahụ ị nọ na-agafe.
6
Ha akọọrọla nzukọ Kraịst nọ nꞌebe a ihe banyere mmeso ọma ịhụnanya i mesoro ha. Biko, mgbe ha si nꞌebe ahụ na-apụ, nyekwara ha aka nꞌije ha dị ka ọ ga-esi tọọ Chineke ụtọ.
7
Nꞌihi na ndị a bụ ndị na-ejegharị na-ekwusa ozi ọma Kraịst. Ha adịghị anakwa ndị ha na-ekwusara ozi ọma ihe oriri ọ bụla, ma ọ bụ uwe, ma ọ bụ ebe ndina. Ego nke ndị na-abụghị ụmụ Chineke adịghị abanye nꞌakpa ha.
8
Nke a mere o ji kwesị ekwesị na anyị ga-elekọta ndị dị otu a ka anyị bụrụ ndị so ha naejikọta aka nꞌotu nꞌọrụ Chineke.
9
Edere m akwụkwọ ntakịrị zigara nzukọ ahụ banyere ihe dị otu a, ma anụrụ m na Daitrifis onye nganga ahụ na-ebuli onwe ya elu, dị ka onyendu ndị Kraịst nọ nꞌebe ahụ, anabataghị ike m nwere nꞌebe ọ nọ. Nꞌihi ya, ọ jụrụ ime ihe m kwuru.
10
Mgbe m bịara aga m agwa gị ihe nile ọ na-eme na ọtụtụ ihe nile ọ na-ekwu megide m, na ụdị okwu ọjọọ nile ọ na-ekwu imebi aha m. Ọ bụghị nanị na ọ jụrụ ịnabata ndị ozi a, kama ọ na-egbochi ndị ọzọ chọrọ inyere ha aka ime otu ahụ. Ihe ọ na-eme bụ isite nꞌụlọ chọọchị chụpụ ndị nile na-anabata ha.
11
Ezi enyi m m hụrụ nꞌanya, ekwela ka ụdị omume ọjọọ dị otu a bata nꞌime gị. Bụrụ onye na-agbaso ihe ziri ezi na eziokwu mgbe nile. Cheta na ndị nile na-eme ezi ihe na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ma ndị ahụ na-anọgide na-adị ndụ nꞌime mmehie na-ezipụta na ha bụ ndị dị anya site nꞌebe Chineke nọ.
12
Ma onye ọ bụla na-ekwu ezi ihe banyere Dimitriọs. Jisọs Kraịst, onye bụ eziokwu ahụ, na-ekwu ihe ọma banyere ya. Ma mụ onwe m na-ekwu otu ihe ahụ banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka m na-agba.
13
Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha nꞌakwụkwọ ozi a.
14
Nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe nile dị ka enyi na enyi ya.
15
Ya mere, ka ihe nile dịrị tutuu anyị ezute. Ndị enyi nile nọ nꞌebe a na-ekele gị. Kelekwaara m ndị nile nọ nꞌebe ahụ ezi ekele dị iche.
Jump to:
Chapter 1
All chapters:
1