bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Ephesians 3
Ephesians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
1
Ọ bụ nꞌihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst nye unu bụ ndị mba ọzọ, jiri na-ekpere Chineke ekpere.
2
Nꞌihi na echere m na unu nụrụ otu Chineke jiri site nꞌamara ya nye m ọrụ ikwusara unu ozi ọma.
3
Chineke kpughere nzube nzuzo ya nile nye m. Ọ bụkwa nke a ka m gwara unu ihe banyere ya nꞌokwu dị nta nꞌakwụkwọ ozi ahụ m detaara unu.
4
Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere unu, unu ga-aghọta ụdị nghọta m nwere banyere ihe omimi nke Kraịst.
5
Nꞌoge gara aga o nweghị onye ọ bụla a gwara banyere ihe omimi a. Ma ugbu a Chineke ekpugheela ya nye ndị ozi ya dị nsọ na ndị amụma ya site nꞌike nke Mmụọ Nsọ.
6
Nke a bụkwa ihe omimi ahụ, na unu bụ ndị mba ọzọ ga-esoro ndị Juu keta ngọzi Chineke site nꞌịnụ na ịnabata ozi ọma ya. Na unu na ndị Juu ga-abụ otu anụ ahụ soro keta nkwa Chineke kwere nꞌime Kraịst.
7
Abụrụla m onye nkwusa ozi ọma a, nꞌihi na Chineke nyere m ọrụ a dị ka onyinye site nꞌịrụ ọrụ nke ike ya.
8
Ee, Chineke nyere m ọrụ a, mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti ụmụ Chineke nile. Ma Chineke họpụtara m ịgwa ndị mba ọzọ ozi ọma banyere agwụghị agwụ nke akụ ebube ahụ pụrụ ịbụ nke ha site nꞌime Kraịst.
9
Chineke zikwara m ịkọwara mmadụ nile na Chineke bụkwa onye nzọpụta nke ndị mba ọzọ. Nꞌihi na nke a bụ ihe onye kere ihe nile zubere na nzuzo ime site na mbụ.
10
Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya nꞌụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya nꞌime nzukọ Kraịst bụ chọọchị.
11
Na dị ka Chineke siri zubekwarị ime ya site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
12
Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.
13
Ya mere, unu adala mba nꞌihi ahụhụ nke m na-ahụ ugbu a. Ha bụ nꞌihi ọdịmma unu.
14
Mgbe m nọdụrụ chee ihe banyere amamihe Chineke na ịdị ukwuu nke nzube ya, ana m ada nꞌala gbuo ikpere nꞌihu Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,
15
Onye ezinụlọ nile dị nꞌụwa a na nke dị nꞌeluigwe na-esite nꞌaka ya enwe aha.
16
Ana m arịọkwa Chineke ka o site nꞌịba ụba nke ebube ya nye unu ike na-esite na Mmụọ Nsọ ya bịa, ka unu bụrụ ndị dị ike nꞌime mmụọ unu.
17
Ana m arịọkwa ka Kraịst mee ka obi unu bụrụ ebe obibi ya site nꞌokwukwe unu nꞌime ya. Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka unu bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ nꞌime ịhụnanya Chineke.
18
Ana m arịọkwa, ka unu na ndị Kraịst nile nwee ike ịghọta enweghị atụ nke ịba ụba na ịdị ukwu nke ịhụnanya Kraịst nꞌebe anyị nọ.
19
Ka unu mata, mazuokwa ụdị ịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ. Ka unu bụrụkwa ndị e mere ka ha jupụta nꞌọdịdị Chineke nꞌonwe ya.
20
Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6