bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Jude 1
Jude 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
1
Ọ bụ Jud, onyeozi Jisọs Kraịst, nwanne Jemes na-edetara unu akwụkwọ a, unu nile Chineke kpọrọ, họpụta, ndị na-adị ndụ nꞌime ịhụnanya ya, na ndị nọkwa nꞌokpuru nchebe Jisọs Kraịst.
2
Ka ebere na udo na ịhụnanya Chineke bụrụ nke unu. Ka ha mụbaakwa nꞌetiti unu.
3
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ gụọla m agụụ idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nꞌotu, ma a chọpụtara m na ọ dị mkpa ugbu a ịdọ unu aka na ntị ka unu na-agbalịsị ike ichebe okwukwe ahụ Chineke nyere ndị ya, ka a ghara ịgbanwe ya.
4
Nꞌihi na ụfọdụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-amaghị Chineke, abatala nꞌetiti anyị. Ndị na-ezi na onye Kraịst ọ bụla pụrụ ibi ụdị ndụ ọ bụla ọ chọrọ na-atụghị egwu ịta ahụhụ nke Chineke na-enye. Ha ajụla Jisọs Kraịst, Nna anyị ukwu na Onyenwe anyị. Ndị a bụkwa ndị ahụ akwụkwọ nsọ gbararị ama banyere ọmụma ikpe dị na-eche ha.
5
Ọ bụ ezie na unu ma ihe ndị a nile, ma achọrọ m ichetara unu otu Chineke si zọpụta ụmụ Izirel site nꞌala Ijipti, na otu o si mesịa laa ndị nile na-ekweghị ekwe nꞌiyi.
6
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.
7
Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.
8
Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.
9
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.
10
Ma ndị a na-ekwulu ihe ọ bụla ha na-aghọtaghi. Dị ka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọ bụla dị ha mma nꞌanya si otu a na-emerụ mkpụrụ obi ha.
11
Ahụhụ ga-adịrị ha nꞌihi na ha esorola nzọ ụkwụ Ken onye gburu nwanne ya. Ha enyefeela onwe ha nꞌaka ime ụdị ihe ọjọọ ahụ Belam mere nꞌihi ego. Dị ka Kora ha enupụla isi megide Chineke sị otu a bụrụ ndị ga-anwụ nꞌihi ọbụbụ ọnụ Chineke.
12
Mgbe ndị a sooro unu nọdụ iri oriri ịhụnanya unu ha dị ka ntụpọ ọjọọ nꞌetiti unu. Ọchị na-eju ha ọnụ mgbe ha ji nri na-afọju ọnụ ha, na-eri nri dị ka ndị ihere na-adịghị eme. Ha anaghị echekwa echiche banyere ndị ọzọ. Ha dị ka igwe ojii nke ikuku na-ebugharị, nke na-adịghị ezo mmiri. Ha na-ekwe nkwa elu na ala, ma ihe ọ bụla adịghị esi ha nꞌaka apụta. Ha dị ka osisi na-adịghị amị mkpụrụ, ọ bụladị nꞌudu mmiri. Ha bụ ndị nwụrụ anwụ, ndị e fopụrụ efopụ site na mgbọrọgwụ ha ka a kpọọ ha ọkụ.
13
Omume ha bụ nanị ihe na-eweta ihere na mmebọ, dị ka ụfụfụ ruru unyi nke ebili mmiri na-esi nꞌosimiri ebupụta nꞌelu ala. Ha na-ejegharị na-acha zaa dị ka kpakpando, ma ahụhụ dị na-eche ha bụ itiri na ọchịchịrị nke Chineke kwadobeere ha.
14
Nke a bụ ihe Enọk onye bụ mmadụ nke asaa na-esota Adam buru nꞌamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na nde nde ndị mmụọ ozi ya.
15
Ọ na-abịa ikpe mmadụ nile ikpe. Ọ ga-enye ndị mmehie ezi ikpe ọmụma ruuru ha, nꞌihi mmehie ha na okwu ọjọọ nile ha kwuru megide Chineke.”
16
Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge nile. Ọ dịghị ihe na-adị ha mma. Ha na-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha chọrọ ime. Ha na-anya isi, na-aja ndị ọzọ, ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nꞌaka ha.
17
Ma unu ndị enyi m, chetanụ! Chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gwara unu na mgbe ochie.
18
Ndị ozi a gwara unu sị, “Nꞌọgwụgwụ oge ahụ, ọ dị ndị ga-abịa jiri unu na-eme ihe ọchị. Ndị a bụ ndị ọchịchọ obi ha bụ nanị ime ihe ọjọọ ọ bụla na-atọ ha ụtọ.
19
Ha bụ ndị na-eweta nkewa na ndị ọchịchọ anụ ahụ ha na-achị. Mmụọ Nsọ ebikwaghị nꞌime ha.”
20
Ma unu ụmụnna m, nọgidenụ naewuli onwe unu elu nꞌime mmụọ unu, nꞌelu ntọ ala ahụ anyị kweere nꞌime ya. Na-ekpenụ ekpere site nꞌike Mmụọ Nsọ.
21
Doonụ onwe unu nꞌokpuru ịhụnanya Chineke, ebe unu ga-anọ na-eche ịnata ndụ ebighị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esite nꞌebere ya nye unu.
22
Gosinụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.
23
Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị.
24
Ugbu a ana m arara unu nye nꞌaka onye ahụ pụrụ ichebe unu, ime ka unu ghara ịda, onye ahụ pụrụ ịkpọbata unu nꞌihu ya dị ebube nꞌọnọdụ enweghị ntụpọ.
25
Ka otuto na ịma mma, na ịdị ukwuu, na ike nile, na ọchịchị nile dịrị onye ahụ nanị ya bụ Chineke, onye zọpụtara anyị site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị siterị na mgbe ochie, ka ọ dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin.
Jump to:
Chapter 1
All chapters:
1