bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Kings 4
1 Kings 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 5 →
1
Eze, bú Solomon, we buru eze Israel nile.
2
Ma ndia bu ndi-isi o nwere; Azaraia nwa Zedok bu onye-nchu-àjà;
3
Elihoref na Ahaija, umu-ndikom Shisha, bu ndi-ode-akwukwọ; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta;
4
Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi usu-ndi-agha; Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà;
5
Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;
6
Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.
7
Solomon nwe-kwa-ra ndikom iri na abua edoro ndi-isi Israel nile, ndi nāzù eze na ulo-ya: nwoke ọ bula nime ha nwe izù eze otù ọnwa n'arọ.
8
Ndia bu kwa aha-ha: Ben-hua, n'ugwu Efraim:
9
Ben-deka, nime Makaz, na nime Shaalbim na Bet-shemesh, na Ilon-bet-hanan:
10
Ben-hesed, n'Arubot; ya nwere Soko na ala Hefa nile:
11
Ben-abinadab, n'ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye:
12
Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:
13
Ben-geba, nime Remot-gilead; ya nwere Havot nke Jaia nwa Manase, nke di na Gilead; ya nwere akuku Agob, nke di na Beshan, ọgu obodo uku atọ nke nwere mb͕idi na nkpọrọ ọla:
14
Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:
15
Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:
16
Beana nwa Hushai, n'Asha na Bealot:
17
Jehoshafat nwa Parua, n'Isaka:
18
Shimai nwa Ila, nime Benjamin:
19
Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.
20
Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.
21
Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.
22
Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;
23
ehi iri mara abuba, na orú ehi site n'ebe anāzù anu, na ọgu aturu ise, nāgughi ele, na mb͕ada, na ob͕o-miri, na ọkuku emere ka ha ma abuba.
24
N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu.
25
Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.
26
Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri.
27
Ndi ahu edoro ndi-isi zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ndi nile nābiaru table nke eze Solomon nso, nwoke ọ bula n'ọnwa-ya: ha ekweghi ka ihe ọ bula kọ ukọ.
28
Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n'ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n'ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ.
29
Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.
30
Amam-ihe Solomon we ba uba kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile, kari kwa amam-ihe Ijipt nile.
31
Ọ we mara ihe kari madu nile; kari Itan onye-Ezrahait, na Himan, na Kalkol, na Dada, bú umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile b͕ara ha buruburu.
32
Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise.
33
O kwu-kwa-ra okwu bayere osisi, site na cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēpuputa na mb͕idi: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu, baye-kwa-ra anu-ufe, baye-kwa-ra ihe nākpu akpu, baye-kwa-ra azù.
34
Ha we si na ndi nile bia inu amam-ihe Solomon, si n'eze nile nke uwa, bú ndi nuru amam-ihe-ya.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22