bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
2 Timothy 4
2 Timothy 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
1
Anamagwasi gi ike n'iru Chineke na Kraist Jisus, Onye gaje ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpé, ewerekwam ngosi-Ya na ala-eze-Ya si gi;
2
kwusa okwu-Ya; tukwasi uche n'ọlu-gi n'oge kwesiri, ma-ọbu n'oge nēkwesighi; tu madu nmehie-ha n'anya, ba nba, riọ aririọ, n'ogologo-ntachi-obi nile na ozizí nile.
3
N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;
4
ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.
5
Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.
6
N'ihi na anāwusim ub͕u a dika àjà-ihe-ọṅuṅu, oge ulam eruwo kwa.
7
Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:
8
nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya.
9
Were inu-ọku-n'obi biakutem ọsọsọ:
10
n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia.
11
Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi.
12
Ma ezigaram Tikikọs n'Efesọs.
13
Uwe nāchu oyi nke m'rapuru na Troas n'aka Kapọs, weta ya mb͕e i gābia, ya na akwukwọ nile, ma nke kachasinu, weta akwukwọ parchment nile.
14
Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di:
15
gi onwe-gi nēche kwa onye ahu nche; n'ihi na o guzogidere okwu-ayi nke-uku.
16
Na ngọpum mbu ọ dighi onye ọ bula nọ n'akukum, kama madu nile rapuru náním: ka aghara igu ya n'isi-ha.
17
Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m'di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n'ọnu ọdum.
18
Onye-nwe-ayi gādọputam n'ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m'bata n'ala-eze-Ya di n'elu-igwe: Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
19
Kele Priska na Akwila, na èzí-na-ulo Ọnisifọrọs.
20
Erastọs nọgidere na Kọrint: ma arapurum Trọfimọs nime Militọs, aru adighi ya ike.
21
Were inu-ọku-n'obi bia tutu mb͕e oyi erue. Yubulọs nēkele gi, ya na Pudins, na Lainọs, na Klọdia, na umu-nna-ayi nile.
22
Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
All chapters:
1
2
3
4