bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ephesians 6
Ephesians 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
1
Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.
2
Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n'iwu nke nkwa diri ya),
3
ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n'elu uwa.
4
Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.
5
Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāṅa nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru, nime afọ-ofufo nke obi-unu, dika unu nēmere Kraist;
6
ọ bughi n'uzọ ibu-orù-n'anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi-unu;
7
were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bughi kwa madu:
8
ebe unu matara na ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n'aka Onye-nwe-ayi, ma ọ bu orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya.
9
Ndi-nwe madu, nēme-kwa-ranu ha otù ihe ahu, nārapu iba-nba-unu: ebe unu matara na Onye-nwe ma ha ma unu nọ n'elu-igwe, ile-madu-anya-n'iru adighi kwa n'ebe Ọ nọ.
10
Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.
11
Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.
12
N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe.
13
N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile.
14
Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume,
15
were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;
16
tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.
17
Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:
18
site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,
19
nēkpe kwa ekpere n'ihim, ka ewe nyem okwu n'isaghe ọnum, iwere nkwuwa-okwu me ka madu mara ihe-omimi nke ozi ọma,
20
nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.
21
Ma ka unu onwe-unu we mata kwa ihe nile bayerem, otú m'nēme, Tikikọs, onye bu nwa-nna-ayi ahu ahuru n'anya, bu kwa onye kwesiri ntukwasi-obi n'ije-ozi nime Onye-nwe-ayi, ọ gēme ka unu mara ihe nile:
22
onye m'nēzigara unu ime otù ihe a, ka unu we mara otú ihe nāgara ayi, ka o we kasi kwa obi-unu.
23
Udo diri umu-nna-ayi, ya na ihu-n'anya nke ya na okwukwe yikọ, site na Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
24
Ka amara diyere ndi nile huru Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'anya n'emebighi-emebi.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
All chapters:
1
2
3
4
5
6