bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Habakkuk 3
Habakkuk 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
1
Ekpere nke Habakuk, bú onye-amuma, n'elu Shigionoth.
2
Jehova, anuwom ihe anuru bayere Gi, m'tua egwu: Jehova, tute ọlu-Gi n'etiti arọ nile, N'etiti arọ̀ nile ka I gēme ka amara ya; N'oké iwe cheta obi-ebere.
3
Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.
4
Onwunwu-Ya di ka ìhè; Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya: Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.
5
N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga, Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.
6
O guzoro, we tùa uwa; O lere anya, we me ka mba nile kuja: Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi, Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala; Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.
7
N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan: Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.
8
Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.
9
Ab͕abasiri uta-Gi ọtọ; Iyi nile aṅuru ebo-Gi nile bu okwu-ọnu kwesiri ntukwasi-obi. Selah I nēji osimiri b͕awa ala.
10
Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali; Okè miri-ozuzo gabigara: Ob͕u-miri mere ka olu-ya da, Chilie aka-ya elu.
11
Anyanwu na ọnwa guzoro n'ebe-obibi-ha; N'ìhè àkú-Gi nile mb͕e ha nāga, N'onwunwu nke ube-Gi nēb͕upu àmùmà.
12
N'oké iwe ka I nāzọ ije n'ala, N'iwe ka I nāzọcha mba di iche iche dika ọka.
13
I putawo ìhè izọputa ndi-Gi, Izọputa onye-Gi etere manu; I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu, B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah
14
I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.
15
I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri, Bú obo nke ọtutu miri.
16
Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.
17
Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:
18
Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova, M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.
19
Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
All chapters:
1
2
3