bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Isaiah 1
Isaiah 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 2 →
1
Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.
2
Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ṅa kwa nti, n'ihi na Jehova ekwuwo okwu: umu ka M'meworo ka ha toputa, emewokwam ka ha di elu, ma umu ahu ejehiewo megidem.
3
Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.
4
Ahuhu gādiri mba nmehie, ndi ajọ omume nānyib͕u, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, umu nke nēbibi onwe-ha: ha arapuwo Jehova, ha elelìwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndi ala ọzọ, laghachi azu.
5
N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.
6
Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.
7
Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-unu, esurewo ha n'ọku; ala-ubi-unu, n'iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ.
8
Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.
9
Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.
10
Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.
11
Jehova nāsi, N'ìhi gini ka unu nāchurum ọtutu àjà-unu? afọ ejuwom n'àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; ọzọ, ọbara oke-ehi na nke umu-aturu na nke nkpi atọghm utọ.
12
Mb͕e unu nābia ka ahu unu n'irum, ònye chọworo nka n'aka-unu, ka unu zọtọ ogigem nile?
13
Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi.
14
Ọnwa ọhu nile unu na mb͕e nile unu akara àkà, nkpuru-obim akpọwo ha asì: ha aghọwo ibu di arọ̀ n'arum, ike ibūru ha agwuwom.
15
Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.
16
Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ:
17
mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.
18
Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.
19
Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri:
20
ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.
21
Ò si-kwa-ra aṅa ghọ nwanyi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n'ikpé ziri ezi! ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ub͕u a ndi-ob͕u-madu.
22
Ọla-ọcha-gi aghọwo afuru-uzu; ihe-ọṅuṅu ọma gi, agwawo ya miri nke-uku.
23
Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.
24
N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom:
25
M'gēme kwa ka akam biaghachi n'aru gi, M'gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M'gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi:
26
M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.
27
Agēji ikpé b͕aputa Zaion, agēji kwa ezi omume b͕aputa ndi-ya nālata.
28
Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.
29
N'ihi na ha gēme ihere osisi terebinth nile nke unu chọsiworo ike, unu gēnwe kwa iru-ihere site n'ubi nile ab͕ara ogige nke unu rọputaworo.
30
N'ihi na unu gādi ka osisi terebinth nke akwukwọ-ya nākpọnwu akpọnwu, na dika ubi ab͕ara ogige nke nēnweghi miri.
31
Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n'otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
53
54
55
56
57
58
59
60
61
62
63
64
65
66