bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Lamentations 5
Lamentations 5
Igbo 2006
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
1
Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru: Legide anya, hu ita-uta-ayi.
2
Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.
3
Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna, Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4
Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5
Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi: Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6
Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7
Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8
Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9
Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi N'ihi mma-agha nke ọzara.
10
Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku Site n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11
Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala, Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12
Ekobere ndi-isi n'aka-ha: Asọpughi iru ndi-okenye.
13
Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri, Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.
14
Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama, Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15
Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo; Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.
16
Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala: Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.
17
N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.
18
N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.
19
Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze; Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.
20
N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?
21
Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.
22
Ma-ọbughi na I jusiwo ayi, Wesa ayi iwe nke-uku.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
All chapters:
1
2
3
4
5