bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Nehemiah 11
Nehemiah 11
Igbo 2006
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
1
Ndi-isi ndi-Ju we biri na Jerusalem: ndi-Ju fọduru fe-kwa-ra nzà, ime ka otù onye nime madu iri bata ibi na Jerusalem, bú obodo nsọ, ka uzọ iteghete ndi fọduru biri kwa n'obodo ọzọ.
2
Ndi-Ju we gọzie ndikom ahu nile ndi were afọ-ofufo nye onwe-ha ibi na Jerusalem.
3
Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.
4
Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n'umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n'umu Perez;
5
na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo.
6
Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà.
7
Ndia bu kwa umu Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaia, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaia.
8
N'iso ya Gabaia, na Salai, na nnù abua na ọgu isi na asatọ.
9
Joel nwa Zikri bu kwa onye nēlekọta ha: Juda nwa Hasenua bu kwa onye nke-abua n'ichi obodo ahu.
10
Site na ndi-nchu-àjà: Jedaia nwa Joiarib, na Jakin,
11
na Seraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke,
12
na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,
13
na umu-nne-ya, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ọgu iri-na-abua na abua: na Amashsai nwa Azarel, nwa Ahzai, nwa Meshilemot, nwa Imea,
14
na umu-nne-ha, bú ndi-dike bu dìnkpà, ọgu isi na asatọ: onye nēlekọta ha bu Zabdiel nwa Hagedolim.
15
Site kwa na ndi Livai: Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, nwa Buni;
16
na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;
17
na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.
18
Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.
19
Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.
20
Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.
21
Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.
22
Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.
23
N'ihi na ihe eze nyere n'iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya.
24
Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.
25
Ma n'obodo ntà nle n'ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;
26
na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet;
27
na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya;
28
na nime Ziklag, na nime Mekona, na n'umu-obodo-ya;
29
na n'En-rimon, na nime Zora, na nime Jamut;
30
na Zanoa, na Adulam, na obodo ntà ha, na Lekish na ọhia-ya nile, na Azeka na umu-obodo-ya. Ha we ma ulo-ikwū-ha site na Bia-sheba rue ndagwurugwu Hinom.
31
Umu Benjamin bi-kwa-ra site na Geba ga n'iru, nime Mikmash, na Aija, na Bet-el na umu-obodo-ya;
32
na Anatot, na Nob, na Anania;
33
na Hezoa, na Rema, na Gitaim;
34
na Hadid, na Zeboim, na Nebalat;
35
na Lod, na Ono, bú ndagwurugwu ndi-ọ̀kà.
36
Site kwa na ndi Livai òkè ufọdu nke Juda diri Benjamin.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
Recommended Reading
Commentary
Nehemiah Commentaries
→
Devotional
Nehemiah Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→