bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Romans 4
Romans 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
1
Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di?
2
N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ.
3
N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.
4
Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ.
5
Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.
6
Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu,
7
si, Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha, Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.
8
Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya.
9
Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.
10
Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù:
11
ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;
12
ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n'ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n'obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n'ebìghi-úgwù.
13
N'ihi na esiteghi n'iwu kwere Abraham ma-ọbu nkpuru-ya nkwa, na ọ gābu onye-nketa nke uwa, kama o sitere n'ezi omume nke okwukwe.
14
N'ihi na asi na ndi ahu ndi sitere n'iwu bu ndi-nketa, emewo okwukwe ka ọ buru ihe-efu, me kwa nkwa ahu ka ọ ghara idi irè:
15
n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.
16
N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.
17
(dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M'meworo gi,) n'iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di.
18
Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi.
19
O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya:
20
o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,
21
nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa.
22
N'ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume.
23
Ma ọ bughi n'ihi nání ya ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na aguru ya nye ya;
24
kama ọ bu kwa n'ihi ayi, ndi agaje igu ya nye ayi, ndi kwere n'Onye ahu Nke mere ka Jisus Onye-nwe-ayi si na ndi nwuru anwu bilie,
25
Onye arara Ya nye n'ihi ndahie-ayi nile, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ihi igu ayi na ndi ezi omume.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16