bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
1 Chronicles 18
1 Chronicles 18
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 19 →
1
Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia.
2
Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
3
Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis.
4
Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
5
Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
6
O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs, ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwara ya ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
7
Devid chịkọtara ọta ọlaedo nke ndịisi agha Hadadeza na-ebu na Jerusalem.
8
Site na Tibhat nakwa Kun, bụ obodo ndị Hadadeza na-achị, Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu, nke Solomọn ji kpụọ Osimiri bronz ahụ, ogidi niile na ngwongwo ndị ọzọ niile nke e ji bronz kpụọ.
9
Mgbe Tou eze Hamat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile nke Hadadeza, eze Zoba,
10
o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa.
11
Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek.
12
Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu.
13
O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
14
Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.
15
Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.
16
Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.
17
Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndịisi nʼọrụ eze.
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29