bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
1 Corinthians 9
1 Corinthians 9
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
1
Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị?
2
Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị.
3
Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a.
4
Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ?
5
Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?
6
Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri?
7
Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta?
8
Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ?
9
Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a?
10
E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.
11
Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu?
12
Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara.
13
Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja?
14
Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.
15
Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye.
16
Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.
17
A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.
18
Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.
19
Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.
20
Nʼebe ndị Juu nọọ, ana m eme dịka onye Juu, ka m nwee ike rite ndị Juu nʼuru. Nʼetiti ndị nọ nʼokpuru iwu, ana m emekwa dịka otu nʼime ndị nọ nʼokpuru iwu (nʼagbanyeghị na mụ onwe m anọghị nʼokpuru iwu), ka m si otu a nwee ike rite ndị nọ nʼokpuru iwu nʼuru.
21
Nʼebe ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nọ, emere m onwe m ka onye na-anọghị nʼokpuru iwu (ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe iwu Chineke na-achọ. Ana m emekwa dịka onye nọ nʼokpuru iwu Kraịst), ka m nwee ike rite ndị na-anọghị nʼokpuru iwu nʼuru.
22
Nʼebe ndị na-adịghị ike nọ, ana m emekwa dịka ha, ka m nwee ike rite ndị na-adịghị ike nʼuru. Otu ọbụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike site nʼụzọ niile ọbụla zọpụta ụfọdụ.
23
Ana m eme ihe ndị a niile nʼihi oziọma, ma ka m nwekwa ike keta oke na ngọzị ya.
24
Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ.
25
Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
26
Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe.
27
Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16