bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
1 Samuel 23
1 Samuel 23
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 24 →
1
Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile.
2
Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.”
3
Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
4
Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”
5
Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
6
(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).
7
Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.”
8
Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.
9
Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”
10
Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.
11
Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.”
12
Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”
13
Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ.
14
Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
15
Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya.
16
Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke.
17
Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.”
18
Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya.
19
Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn?
20
Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”
21
Sọl zara ha sị, “ Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi.
22
Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ.
23
Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.”
24
Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn.
25
Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ.
26
Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid.
27
Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.”
28
Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa.
29
Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
Recommended Reading
Commentary
1 Samuel Commentaries
→
Devotional
1 Samuel Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a) Study Bible
→