bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
2 Thessalonians 1
2 Thessalonians 1
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
1
Pọl, na Saịlas, na Timoti dere akwụkwọ a, Na-edegara nzukọ dị nʼobodo Tesalonaịka nʼime Chineke Nna anyị, na nʼime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
2
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3
Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa.
4
Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.
5
Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya.
6
Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu.
7
Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè.
8
Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9
Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,
10
nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.
11
Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.
12
Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3