bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
3 John 1
3 John 1
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jump to:
Chapter 1
1
Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.
2
Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.
3
Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ.
4
O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
5
Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị.
6
Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto.
7
Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe.
8
Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
9
Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma.
10
Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.
11
Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya.
12
Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba.
13
Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha.
14
Ọ bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu.
15
Ka udo dịrị gị. Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.
Jump to:
Chapter 1
All chapters:
1