bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Exodus 17
Exodus 17
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 18 →
1
Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ.
2
Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”
3
Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?”
4
Nʼihi ya, Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.”
5
Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa.
6
Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile.
7
Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “ Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”
8
Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim.
9
Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.”
10
Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ.
11
Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya.
12
Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara.
13
Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.
14
Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”
15
Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m.
16
Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze Onyenwe anyị dị. Onyenwe anyị ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40