bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Hebrews 5
Hebrews 5
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 6 →
1
A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche.
2
Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume.
3
Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ.
4
O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.
5
Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”
6
Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”
7
Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya.
8
Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara.
9
Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi.
10
Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
11
Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ.
12
Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.
13
Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume.
14
Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13