bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Jeremiah 23
Jeremiah 23
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 24 →
1
“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
2
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
3
“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.
4
Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5
“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
6
Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, Izrel ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.
7
“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’
8
ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
9
Ma banyere ndị amụma, obi m na-agbawa nʼime m, ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, dịka onye ṅụbigara mmanya oke, nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, na site nʼokwu nsọ ya.
10
Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.
11
“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12
“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
13
“Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.
14
Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”
15
Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”
16
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha
17
Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘ Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’
18
Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
19
Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.
20
Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya tutu ruo mgbe o mezuru ihe niile dị ya nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.
21
Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, ma ha nọkwa na-ebu amụma.
22
A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
23
“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
24
“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
25
“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’
26
Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?
27
Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.
28
Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
29
“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
30
Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.
31
E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’
32
Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
33
“Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’
34
Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.
35
Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’
36
Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.
37
Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’
38
Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’
39
Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.
40
Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
Recommended Reading
Commentary
Jeremiah Commentaries
→
Devotional
Jeremiah Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a) Study Bible
→